Free account: track your progress — Sign up free

BECE Igbo Language 2023 Objective — Question 1

Question 1 of 120 from the Basic Education Certificate Examination (Junior WAEC) (BECE) Igbo Language 2023 Objective paper, with the correct answer and a full explanation.

Advertisement

GỤỌ EDEREEDE NDỊ A MA ZAA AJỤJỤ NDỊ SO HA EDEREEDE NKE MBỤ Omenaala bụ ihe e jiri mara obodo ọbụla. N'ala Igbo, omenaala bụ ozuru Igbo ọnụ. Obodo ọbụla nwere usoro ha si eme omenaala ha. Omenaala ndị Igbo gụnyere ndị a: iri ji, iti mmanwụ, iru mgbede, ichi nze na ọzọ, ile ọmụgwọ, ịlụ nwaanyị, iwa oji na ọtụtụ ndị ọzọ. Omenaala ndị a niile nwere ụbọchị nakwa oge obodo ọbụla ji eme ya. Ọ bụ ụmụnwoke tozuru etozu na-echi nze na ọzọ n'obodo. Ndị bịara abịa anaghị echi ya. Ndị chiri nze na ọzọ anaghị atụ asị, ha anaghị ezu ohi, arị elu, añụbiga mmanya oke, achụ nwaanyị, eri nri n'ọha, arụ arụrụ ala, alụ ogu maọbụ ekpe ikpe mmegide. Ha na-ekwu eziokwu. Olee nke na-abụghị omenaala Igbo na ndị a?

  • A. Igbu mmadụCorrect
  • B. Ile ọmụgwọ
  • C. Iru mgbede
  • D. Ịlụ nwaanyị
  • E. Iwa oji

Explanation

Igbu mmadụ abụghị omenaala; ndị ọzọ bụ omenaala Igbo.

Advertisement

Sign up free to unlock

  • Score tracking
  • Practice history
  • Saved questions
  • Progress dashboard
  • Personalized sessions
  • Weak-topic breakdown

…and/or go further with premium services and No Ads.