Free account: track your progress — Sign up free

BECE Igbo Language 2023 Objective Past Questions

All 120 questions from the Basic Education Certificate Examination (Junior WAEC) (BECE) Igbo Language 2023 Objective paper, with the correct answer and a full explanation for each. Free, no signup needed.

Advertisement

Igbo Language 2023 Objective — Question 1

GỤỌ EDEREEDE NDỊ A MA ZAA AJỤJỤ NDỊ SO HA EDEREEDE NKE MBỤ Omenaala bụ ihe e jiri mara obodo ọbụla. N'ala Igbo, omenaala bụ ozuru Igbo ọnụ. Obodo ọbụla nwere usoro ha si eme omenaala ha. Omenaala ndị Igbo gụnyere ndị a: iri ji, iti mmanwụ, iru mgbede, ichi nze na ọzọ, ile ọmụgwọ, ịlụ nwaanyị, iwa oji na ọtụtụ ndị ọzọ. Omenaala ndị a niile nwere ụbọchị nakwa oge obodo ọbụla ji eme ya. Ọ bụ ụmụnwoke tozuru etozu na-echi nze na ọzọ n'obodo. Ndị bịara abịa anaghị echi ya. Ndị chiri nze na ọzọ anaghị atụ asị, ha anaghị ezu ohi, arị elu, añụbiga mmanya oke, achụ nwaanyị, eri nri n'ọha, arụ arụrụ ala, alụ ogu maọbụ ekpe ikpe mmegide. Ha na-ekwu eziokwu. Olee nke na-abụghị omenaala Igbo na ndị a?

  • A. Igbu mmadụCorrect
  • B. Ile ọmụgwọ
  • C. Iru mgbede
  • D. Ịlụ nwaanyị
  • E. Iwa oji

Explanation

Igbu mmadụ abụghị omenaala; ndị ọzọ bụ omenaala Igbo.

Igbo Language 2023 Objective — Question 2

N'edereede a, ndị chiri nze na ọzọ na-eme otu na ndị a.

  • A. Achụ nwaanyị
  • B. Añụ mmanya oke
  • C. Arị elu
  • D. Ekpe ikpe mmegide
  • E. Ekwu eziokwuCorrect

Explanation

Edereede kwuru na ha na-ekwu eziokwu.

Igbo Language 2023 Objective — Question 3

Mejuo ahịrị a si n'edereede a. Obodo ọbụla nwere ______ ha si eme omenaala ha.

  • A. afọ
  • B. ebe
  • C. ndị
  • D. obodo
  • E. usoroCorrect

Explanation

Edereede kwuru: "usoro ha si eme omenaala ha".

Igbo Language 2023 Objective — Question 4

Kedu ndị nwere ike ichi nze na ọzọ? Ụmụ/Ndị

  • A. bịara abịa
  • B. ntakịrị
  • C. ntorobịa
  • D. nwaanyị
  • E. nwoke tozuru etozuCorrect

Explanation

Ọ bụ ụmụnwoke tozuru etozu na-echi nze na ọzọ.

Igbo Language 2023 Objective — Question 5

N'edereede a, olee ihe e jiri mara obodo ọbụla?

  • A. Abamaba
  • B. Echimechi
  • C. Ewumewu
  • D. Nze na ọzọ
  • E. OmenaalaCorrect

Explanation

Omenaala bụ ihe e jiri mara obodo ọbụla.

Igbo Language 2023 Objective — Question 6

EDEREEDE NKE ABỤỌ Agwa bụ mma nwaanyị. Nke a pụtara ihe n'ebe Ugomma nwunye Maazị Obioha nọ. Ugomma bụ nwaanyị nwere ugwu na mmpụrụ n'ebe di ya na ụmụnne di ya nọ. Ihe ka Ugomma mkpa bụ ka ọ gaesi mee ka ezinaụlọ di ya na nke nna ya na-eto eto. Ugomma gụrụ akwụkwọ ma nke a emeghị ka ọ malite ịkpa agwa ọjọọ. Ọ weere onye ọbụla otu ọ si were onwe ya. Nke a mere di ya na ụmụnne di ya ji hụ ya n'anya nke ukwuu. Ugomma mụrụ ụmụ anọ, ha bụ Akụnne, Akụọma, Erimma na Emeka. Ụmụnwaanyị atọ Ugomma mụtara mechara banyechaa Mahadum Nsukka. Ha nwetara nzere digirii na nọosụ, injinia na okaikpe n'otu n'otu. Emeka bụ dibịa oyibo. Ọ nwetara nzere a na Mahadum Ọka. Olee aha nwunye Obioha?

  • A. Akụnne
  • B. Akụọma
  • C. Emeka
  • D. Erimma
  • E. UgommaCorrect

Explanation

Ugomma bụ nwunye Maazị Obioha.

Igbo Language 2023 Objective — Question 7

Kedu nke na-esoghị na nzere ụmụ Ugomma nwetara na mahadum? Nzere

  • A. dibịa oyibo
  • B. injinia
  • C. nọosụ
  • D. ogbakọegoCorrect
  • E. okaikpe

Explanation

Ha nwetara dibịa oyibo, injinia, nọosụ na okaikpe; ogbakọego adịghị.

Igbo Language 2023 Objective — Question 9

Olee aha nwa Ugomma nke nwetara nzere digirii na Mahadum Ọka?

  • A. Akụnne
  • B. Akụọma
  • C. EmekaCorrect
  • D. Erimma
  • E. Obioma

Explanation

Emeka bụ dibịa oyibo, ọ nwetara nzere na Mahadum Ọka.

Igbo Language 2023 Objective — Question 11

EDEMEDE Adịresị ole ka leta nkeonye na-enwe?

  • A. Otu
  • B. AbụọCorrect
  • C. Atọ
  • D. Anọ
  • E. Ise

Explanation

Leta nkeonye nwere adịresị abụọ: nke onye dere na nke onye ọ na-edere.

Igbo Language 2023 Objective — Question 13

Kedu udị leta onye chọrọ ikuputa nwa na-ede? Leta

  • A. akpọmoku
  • B. anamachọihe
  • C. arịrịọCorrect
  • D. mkpesa
  • E. nkeonye

Explanation

Ọ na-arịọ, ya mere leta arịrịọ.

Igbo Language 2023 Objective — Question 14

Leta nwataakwụkwọ degaara kọmishọna maka ahụike ka a na-akpọ leta

  • A. akụkọ
  • B. akpọmoku
  • C. anamachọiheCorrect
  • D. mkpesa
  • E. nkeonye

Explanation

Leta e degaara onye ọchịchị bụ leta anamachọihe.

Igbo Language 2023 Objective — Question 20

Olee nkejiasụsụ na-eme ka ahịrịokwu nwee echiche zuru oke?

  • A. Mbụụzọ
  • B. NgwaaCorrect
  • C. Nkọwaaha
  • D. Nkwuwa
  • E. Nnọchiaha

Explanation

Ngwaa na-eme ka ahịrịokwu zuo oke.

Igbo Language 2023 Objective — Question 21

Ezinwa na-ekwu okwu nwayọọ nwayọọ. Okwu a kara ihe n'okpuru bụ

  • A. ngwaa
  • B. nkọwaahaCorrect
  • C. nkwuwa
  • D. nnọchiaha
  • E. ọnụọgụgụ

Explanation

Nwayọọ nwayọọ na-akọwa ka e si ekwu okwu.

Igbo Language 2023 Objective — Question 23

Họputa ebe 'na' na-arụ ọrụ dịka nnyemakangwaa na ndị a.

  • A. Ada bi n'Ọka
  • B. Anụ na azụ dị ụtọ
  • C. Eze bi na LegọọsịCorrect
  • D. Ha nọ n'elu oche
  • E. Okeke na-akụ ekwe

Explanation

Na na Legọọsị na-egosi ebe; ọ bụ nnyemakangwaa.

Igbo Language 2023 Objective — Question 24

Nna m zụtara ewu ọjii n'ahịa taa. Okwu a kara ihe n'okpuru bụ

  • A. mbụụzọ
  • B. mkpọaha
  • C. ngwaa
  • D. nkọwaahaCorrect
  • E. nnọchiaha

Explanation

Ọjii na-akọwa ewu; ọ bụ nkọwaaha.

Igbo Language 2023 Objective — Question 25

Depụta ọnụọgụgụ a 1999 n'Igbo. Otu puku, narị itoolu

  • A. iri itoolu na itoolu.Correct
  • B. iri itoolu na itoolu iri.
  • C. itoolu
  • D. na iri itoolu
  • E. na itoolu

Explanation

1999 = otu puku, narị itoolu, iri itoolu na itoolu.

Igbo Language 2023 Objective — Question 26

Depụta nọmba mpekele a 4/5 n'Igbo.

  • A. Anọ e kere ụzọ iseCorrect
  • B. Anọ e wepụrụ ise
  • C. Anọ n'ime ise
  • D. Ise e kere ụzọ anọ
  • E. Ise n'ime anọ

Explanation

4/5 = anọ e kere ụzọ ise.

Igbo Language 2023 Objective — Question 32

Gịnị na-akụ n'elekere a?

Diagram for question 32
  • A. Elekere asaa kpọmkwem.Correct
  • B. Ọ jirila nkeji asaa gafee elekere iri na abụọ.
  • C. Ọ jirila nkeji iri na abụọ gafee elekere asaa.
  • D. Ọ fọrọ nkeji asaa ka elekere iri na abụọ kụọ.
  • E. Ọ fọrọ nkeji iri abụọ na ise ka ọ kụọ elekere asaa.

Explanation

Mkpịsị mkpụmkpụ dị na 7, nke ogologo dị na 12; ya bụ elekere asaa kpọmkwem.

Igbo Language 2023 Objective — Question 33

Ọ fọdụrụ nkeji iri na ise ka elekere anọ nke ụtụtụ kụọ pụta

  • A. 3:45 amCorrect
  • B. 4:15am
  • C. 3:45pm
  • D. 4:15pm
  • E. 4:45pm

Explanation

Nkeji 15 tupu 4 nke ụtụtụ bụ 3:45 am.

Igbo Language 2023 Objective — Question 40

Okeke gbara ọsọ n'ụtụtụ taa. Họputa nke bụ ngwaa n'ahịrịokwu a.

  • A. GbaraCorrect
  • B. Okeke
  • C. Ọsọ
  • D. Taa
  • E. Ụtụtụ

Explanation

Gbara na-egosi ihe Okeke mere; ọ bụ ngwaa.

Igbo Language 2023 Objective — Question 43

Mkpụrụabịịchịị Igbo dị

  • A. asatọ
  • B. itoolu
  • C. iri na itoolu
  • D. iri abụọ na asatọ
  • E. iri atọ na isiiCorrect

Explanation

Mkpụrụ edemede Igbo dị 36 (iri atọ na isii).

Igbo Language 2023 Objective — Question 57

I have a book.

  • A. Anyị nwere akwụkwọ.
  • B. Enwere m otu akwụkwọ.Correct
  • C. Ha nwere otu akwụkwọ.
  • D. Ha nyere m akwụkwọ.
  • E. Ọ nwere akwụkwọ.

Explanation

Enwere m = I have.

Igbo Language 2023 Objective — Question 58

I have three brothers.

  • A. Anyị nwere ụmụnne nwoke atọ.
  • B. E nwere ụmụnne nwoke atọ.
  • C. Enwere m ụmụnne nwoke atọ.Correct
  • D. Ha nwere ụmụnne nwoke atọ.
  • E. I nwere ụmụnne nwoke atọ.

Explanation

Enwere m = I have.

Igbo Language 2023 Objective — Question 59

The lion killed a goat.

  • A. Agụ gburu ewu.Correct
  • B. Agụ riri ewu ahụ.
  • C. Agụ tara ewu.
  • D. Ewu ahụ gburu agụ.
  • E. Ewu gburu agụ.

Explanation

Lion = agụ, killed = gburu, goat = ewu.

Igbo Language 2023 Objective — Question 61

PAPER II AGỤMAGỤ ỌDỊNAALA Ole ka e kere agụmagụ?

  • A. Abụọ
  • B. AtọCorrect
  • C. Anọ
  • D. Ise
  • E. Isii

Explanation

A kere agụmagụ ụzọ atọ: abụ, ejije, ejiji-okwu (prose).

Igbo Language 2023 Objective — Question 63

Onye gbuwe achara Onye gbuwe Onye akpọla ibe ya Onye ikoni. Nke a bụ abụ

  • A. agha
  • B. akwa
  • C. nwaCorrect
  • D. ọtụtọ
  • E. ọrụ

Explanation

Abụ egwuregwu ụmụaka ka a bụ.

Igbo Language 2023 Objective — Question 65

Ọnwụ emee anyị arụ oo Ọnwụ emee anyị arụ oo Ọ bụrụ ọ gbalaga Olee udị abụ nke a bụ? Abụ

  • A. akwaCorrect
  • B. ikpe
  • C. nkọcha
  • D. ọtụtọ
  • E. ọrụ

Explanation

Abụ akwa bụ abụ ịkwa ákwá n'oge ọnwụ.

Igbo Language 2023 Objective — Question 66

Cha kpịị Wọọ Nkịta nyaa akpa Nsị agwụ n'ọhịa Ahịrị a bụ mbido akụkọ

  • A. agụmagụ
  • B. ifoCorrect
  • C. ndịichie
  • D. neegwu
  • E. okike

Explanation

Ahịrị ndị a bụ mbido akụkọ ifo.

Igbo Language 2023 Objective — Question 67

Ụkpana ọkpọkọ buuru nti chiri ya. Kedu udị atụmatụokwu nke a bụ?

  • A. Agwụgwa
  • B. Ilu
  • C. Mbụrụ
  • D. MmemmadụCorrect
  • E. Myiri

Explanation

Ụkpana ọkpọkọ na-eme ihe dị ka mmadụ; ọ bụ mmemmadụ.

Igbo Language 2023 Objective — Question 68

Gwa m, gwa m, gwa m agbọghọ toro n'afọ laa n'afọ?

  • A. Agwa
  • B. Akpụ
  • C. Awọ
  • D. ỌkaCorrect
  • E. Ụtụ

Explanation

Ọ bụ ajụjụ ndakọrịta (nkọ); azịza bụ Ọka.

Igbo Language 2023 Objective — Question 69

Diochi chiri nti chie nkwu, nkwu chie nti chaa akwu. Ahịrị a bụ

  • A. akpaalaokwu
  • B. egbeokwuCorrect
  • C. nhagideokwu
  • D. nsinụụda
  • E. okwuntụhị

Explanation

Ahịrị a bụ egbeokwu (tongue twister).

Igbo Language 2023 Objective — Question 70

Nneaku bituru mma aka pụtara na Nneaku

  • A. gba mma n'aka
  • B. ji mma n'aka
  • C. mara mma nke ukwuu.
  • D. metụrụ aka na mma.Correct
  • E. na-ebitu mma aka.

Explanation

Nneaku metụrụ aka na mma.

Igbo Language 2023 Objective — Question 71

Họputa nke na-abụghị akpaalaokwu na ndị a.

  • A. Aji adịghị ya na nku.
  • B. Bịa ka anyị taa ọjị.Correct
  • C. Emeka tara isi mbe.
  • D. Nneka na-eme aka abụọ.
  • E. Ọgọnna nwere ire abụọ.

Explanation

Bịa ka anyị taa ọjị bụ ahịrị nkịtị, ọ bụghị akpaalaokwu.

Igbo Language 2023 Objective — Question 72

Họputa nke bụ njirimara agụmagụ ọdịnaala.

  • A. A maara aha onye dere ya.
  • B. A na-ahụ ya anya.
  • C. A na-azụta ya n'ahịa.
  • D. Edeghị ya ede n'akwụkwọ.Correct
  • E. E nwere ike igụ ya n'oge a chọrọ.

Explanation

Agụmagụ ọdịnaala bụ nke a na-ekwu ọnụ, edeghị ya.

Igbo Language 2023 Objective — Question 74

Họputa nke bụ ilu na ndị a.

  • A. Adaeze mara mma.
  • B. Chioma gara n'ụlọ di ya.
  • C. Ha tara isi mbe.
  • D. Onyeka bụ ezi.
  • E. Ụkwa ruo oge ya, ọ daa.Correct

Explanation

Ụkwa ruo oge ya, ọ daa bụ ilu.

Igbo Language 2023 Objective — Question 75

Mejuo ilu a: Ehi na-enweghị ọdụdụ chi ya na-achụrụ ya...

  • A. anwụnta
  • B. ijijiCorrect
  • C. ngwere
  • D. ọkè
  • E. ụchịcha

Explanation

Ilu ahụ bụ: chi ya na-achụrụ ya ijiji.

Igbo Language 2023 Objective — Question 76

IDUUAZỊ (PROSE) Ikeọra, A: Uwa Dị Omimi Olee obodo Maazị Ejike kpọọrọ Nọnso gaa ka mma ya nwụchara?

  • A. Ogidi
  • B. ỌbaCorrect
  • C. Ọka
  • D. Ọnịcha
  • E. Ugwuọba

Explanation

Ọ bụ Ọba.

Igbo Language 2023 Objective — Question 77

Ejike hapụrụ Nọnso n'ụlọ ka ọ matachaa ala tupu ọ malite

  • A. igaụka
  • B. igbaegwu
  • C. igụ akwụkwọCorrect
  • D. iguegwu
  • E. iri nri

Explanation

Ọ chọrọ ka ọ matachaa ala tupu ọ malite igụ akwụkwọ.

Igbo Language 2023 Objective — Question 78

Kedu ihe mere Ejike jiri ñụọ iyi si na ọ ga-azụ Nọnso na mahadum? Ọ bụ maka na

  • A. ndị ụlọakwụkwọ ha ji ya eje mba.Correct
  • B. ọ ma eje ozi.
  • C. ọ ma esi nri.
  • D. ọ mara mma.
  • E. ọ naghị eme nke ọma.

Explanation

Ọ bụ maka ndị ụlọakwụkwọ ha ji ya eje mba.

Igbo Language 2023 Objective — Question 79

Aha obodo na-achọ onye ha ga-eji isi ya wee rekwaa agwụ ha n'afọ ahụ bụ

  • A. Amaọkọrọbịa
  • B. Amaụdara
  • C. Obodo Agwụ
  • D. Obodo ArụsịCorrect
  • E. Ụmụnebo

Explanation

Ọ bụ Obodo Arụsị.

Igbo Language 2023 Objective — Question 83

Ihe abụọ ndị Ụmụike enweghị bụ

  • A. ahịa na ngwaahịa
  • B. nku na osimmiri
  • C. oku na mmiriCorrect
  • D. ubi na ngwaubi
  • E. ụlọ na ọhịa

Explanation

Ndị Ụmụike enweghị oku na mmiri.

Igbo Language 2023 Objective — Question 84

EJIJE (DRAMA) Okafọ, S.N: Aka Ekpuchi Eziokwu Olee obodo nwanne Maazị Ọsọndụ kpọọrọ Izunna gaa?

  • A. Akwaeze
  • B. EnuguCorrect
  • C. Ọgbaru
  • D. Ọka
  • E. Ọnịcha

Explanation

Ọ bụ Enugu.

Igbo Language 2023 Objective — Question 85

Ụle Isunna lere ka ọ gụchara sekọndịrị nke atọ bụ

  • A. Anambara Gọọmentị Kọleji.Correct
  • B. Federal Gọọmentị Kọleji.
  • C. Jigawa Gọọmentị Kọleji.
  • D. Legọọsị Gọọmentị Kọleji.
  • E. Owere Gọọmentị Kọleji.

Explanation

Ọ gụchara n'Anambara Gọọmentị Kọleji.

Igbo Language 2023 Objective — Question 91

EJIJE (DRAMA) Agụgụ, M. O.: Ka Ị Ma Nke A... “Ị ga-asị na ị hụghị na ọ na-etopụta agbọghọịa n'ike n'ike”. Onye kwuru okwu a?

  • A. Akịdị
  • B. Nnadị
  • C. Okeke
  • D. ỌdịnakaCorrect
  • E. Ojiugo

Explanation

Ọdịnaka bụ onye kwuru okwu a.

Igbo Language 2023 Objective — Question 94

“Ma m onwe m, ọ bụ ugbu a ka m ghọtara na ndụ enweghị ihe ọ bụ maọbụrụ na Christ anọghị n'ime ya. Ọ bụghị sọ ndụ, ma ụwa niile.” Onye kwuru okwu a?

  • A. Ada
  • B. Chinyere
  • C. IhuọmaCorrect
  • D. Nneọma
  • E. Ojiugo

Explanation

Ihuọma kwuru okwu a.

Igbo Language 2023 Objective — Question 96

ABỤ (POETRY) Ihejirika O. C.: Zereụwa N'abụ “Obodo M Naijiria”, agbụrụ ole nọ n'obodo Naijiria?

  • A. AnọCorrect
  • B. Ise
  • C. Asaa
  • D. Asatọ
  • E. Iri

Explanation

Abụ ahụ kwuru agbụrụ anọ.

Igbo Language 2023 Objective — Question 97

Emejọrọ m onye? Ekwujọrọ m onye? Anọchiri m onye? Kedu atụmatụokwu pụtara ihe n'abụ a?

  • A. AjụjụnzaraonweCorrect
  • B. Akpaalaokwu
  • C. Egbeokwu
  • D. Mbụrụ
  • E. Myiri

Explanation

Ajụjụ ndị a abụghị maka azịza; ọ bụ ajụjụnzaraonwe.

Igbo Language 2023 Objective — Question 98

Nne mụrụ Dọra Akụnyịlị Okonjọ Iwuala Oby Ezekwesili Ndịị Okereke Onyiuke Olee abụ nwe ahịrị ndị a?

  • A. Aka m dị ọcha
  • B. Anwụnta
  • C. Ekwenti
  • D. Nwaanyị bụ nwa
  • E. OmemnọbiCorrect

Explanation

Ahịrị ndị a bụ nke abụ Omemnọbi.

Igbo Language 2023 Objective — Question 100

Ọrịa bịara ugbu a Bụ ọnyịrị ogwu Ọ sị mbe Ofesi Anyị anụghị kpọ n'elu Naanị tii n'ala anyị. Onye nabatara ya? Naanị Chineke ma. Olee abụ nwe ahịrị a?

  • A. Agha amara ọkwa yaCorrect
  • B. Aka m dị ọcha
  • C. Anwụnta
  • D. Ekwenti
  • E. Omemnọbi

Explanation

Abụ ahụ bụ Agha amara ọkwa ya.

Igbo Language 2023 Objective — Question 101

OMENAALA NA EWUMEWU Olee onye ọ bụ ọrụ ya ịhụ na ụmụaka dị ọcha n'ezinaụlọ?

  • A. Diọkpara
  • B. Nna
  • C. NneCorrect
  • D. Ụmụaka
  • E. Ụmụọkpụ

Explanation

Nne na-ahụ maka ịdị ọcha nke ụmụaka.

Igbo Language 2023 Objective — Question 104

Họputa nke na-abụghị omenaala Igbo n'ebe a.

  • A. Ịle ọmụgwọ
  • B. Iru mgbede
  • C. Igụ akwụkwọCorrect
  • D. Ịlụ nwaanyị
  • E. Iwa

Explanation

Igụ akwụkwọ bụ ihe ndị Bekee kpatara.

Igbo Language 2023 Objective — Question 108

Nwaanyị ajadụ n'ala Igbo bụ nwaanyị dị ya

  • A. chiri echichi
  • B. dị ndụ
  • C. nọ n'ọrịa
  • D. nwụrụ anwụCorrect
  • E. ruru ụlọ

Explanation

Ajadụ bụ nwaanyị di ya nwụrụ.

Igbo Language 2023 Objective — Question 110

Otu n'ime ndị a esoghị n'ihe e ji aga alụ nwaanyị n'ala Igbo.

  • A. Akụ nwaanyị
  • B. Mmanya
  • C. NriCorrect
  • D. Ọjị
  • E. Ọmụ

Explanation

Nri abụghị ihe e ji aga alụ nwaanyị.

Igbo Language 2023 Objective — Question 111

Họputa nke na-abụghị uru ọmụ nkwụ bara.

  • A. Ikedo n'ụgbọala bụ ozu.Correct
  • B. Ike ngwugwu.
  • C. Itinye ya n'ala dị na ndọrọ ndọrọ.
  • D. Itinye ya n'ụlọ obibi.
  • E. Ịkpa nkata.

Explanation

Ikedo n'ụgbọala abụghị uru ọmụ nkwụ.

Igbo Language 2023 Objective — Question 112

Ndị a niile nwere ike ime mmadụ iga n'afa ma e wepụ

  • A. akpata a tufuo
  • B. amụtaghị nwa
  • C. iri oke nriCorrect
  • D. oke ọrịa
  • E. ọnwụ ike

Explanation

Iri oke nri adịghị eme mmadụ iga n'afa.

Igbo Language 2023 Objective — Question 113

Olee nke esoghị n'uru nwoke na-enweta site n'ịlụ nwaanyị?

  • A. Idebe ebe niile ọcha
  • B. Inye aka
  • C. Isesa ya okwuCorrect
  • D. Isiri ya nri
  • E. Ịmụtara ya nwa

Explanation

Isesa ya okwu abụghị uru.

Igbo Language 2023 Objective — Question 118

Aha ọzọ e nwere ike ịkpọ otuọgbọ bụ

  • A. nwadiala
  • B. otuebiri
  • C. ụmụada
  • D. ụmụnna
  • E. ụmụọkpụCorrect

Explanation

Ụmụọkpụ bụ aha ọzọ nke otuọgbọ.

Igbo Language 2023 Objective — Question 119

Otu na ndị a abụghị ihe e ji anabata ọbịa n'ala Igbo.

  • A. Akụ ilu
  • B. AñaraCorrect
  • C. Kwulikwuli
  • D. Ose ọjị
  • E. Ọjị

Explanation

Añara abụghị ihe e ji anabata ọbịa.

Igbo Language 2023 Objective — Question 120

Họputa nke esoghị n'omenaala metụtara nwa n'ala Igbo.

  • A. Ịle ọmụgwọ
  • B. Igụ aha
  • C. Ịhụ eze
  • D. Ịpụ ahịa nwa
  • E. Iwa ọjịCorrect

Explanation

Iwa ọjị abụghị omenaala metụtara nwa.

Advertisement

Sign up free to unlock

  • Score tracking
  • Practice history
  • Saved questions
  • Progress dashboard
  • Personalized sessions
  • Weak-topic breakdown

…and/or go further with premium services and No Ads.