Free account: track your progress — Sign up free

BECE Igbo Language 2025 Objective — Question 1

Question 1 of 67 from the Basic Education Certificate Examination (Junior WAEC) (BECE) Igbo Language 2025 Objective paper, with the correct answer and a full explanation.

Advertisement

EDEREEDE NKE MBỤ Ọkwadike bụ onye Abọsị nke dị n'okpuru ọchịchị Ngele nke Abịa Steeti. Ọ bụ otu nwa n'afọ nne ya n'ihi na nna ya bụ Maazị Udenze lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ nke aha ha bụ Ezinne na Ọbịageri. Mgbe Ọkwadike chọrọ ịlụ nwaanyị, ọ lụrụ Egodị. Egodị bụ nwa agbọgho mara mma e ji eje mba ma gụkwaa maka ịbụ onye ọgbakọ ego na mahadum. Ezema nwa nwunye dị nne ya malitere inwe anya ụfụ n'ebe Ọkwadike nọ. Iwe ya bụ na ọ gaghị adị ndụ hụ ebe Ọkwadike lụrụ nwaanyị ka nke ya mma. Ọ gara na nke dibịa gwọọ ọgwụ ka Egodị ghara ịmụta nwa. Mgbe otu afọ gachara, o nweghị ihe a hụrụ. Ọkwadike na nwunye ya bụ Egodị gara ụlọogwụ elu na ala ma o nwekwaghị ihe a hụrụ. Egodị bidoro bewere chi ya akwa ma werekwa ekpere mere nri. Ka ọ na-eme ọnwa iri na otu, ahụ Egodị bidoro igbanwe, ya na dị ya gara ụlọogwụ, o wee bụrụ na ọ dị ime ọnwa atọ. Ọ mechara mụọ ụmụ ejima. Añụrị juputara ya na dị ya obi n'ihi na chi ha kwesịrị ntụkwasị obi. Mgbe oge ruru ha iga ụka nwa, ha siri nri dị iche iche ma kpọọ ndị mmadụ. Ezema siri ka ọ gaa mara ma ọ bụ eziokwu, sịkwa na ọ gaghị adị ndụ o mee. Ka o ruru, ọ hụrụ ụmụaka abụọ ahụ. Ọ daa n'ala ma bido sawa asịsa si na ọ bụ ya mere na Egodị amụtaghị nwa ka mgbe. Ndị obodo bidoro buwa ya asọ, ụfọdụ malite iti ya ihe nke na Igwe ha bụ Obieziokwu zigara ndị odibo ya ka ha gaa chụpụ ya n'obodo n'ihi arụ o mere. Aha nwunye Ọkwadike bụ

  • A. Egodị.Correct
  • B. Ezema.
  • C. Ezinne.
  • D. Nnedị.

Explanation

Ọkwadike chọrọ ịlụ nwaanyị, ọ lụrụ Egodị: his wife is Egodị.

Advertisement

Sign up free to unlock

  • Score tracking
  • Practice history
  • Saved questions
  • Progress dashboard
  • Personalized sessions
  • Weak-topic breakdown

…and/or go further with premium services and No Ads.