Free account: track your progress — Sign up free

BECE Igbo Language 2025 Objective Past Questions

All 67 questions from the Basic Education Certificate Examination (Junior WAEC) (BECE) Igbo Language 2025 Objective paper, with the correct answer and a full explanation for each. Free, no signup needed.

Advertisement

Igbo Language 2025 Objective — Question 1

EDEREEDE NKE MBỤ Ọkwadike bụ onye Abọsị nke dị n'okpuru ọchịchị Ngele nke Abịa Steeti. Ọ bụ otu nwa n'afọ nne ya n'ihi na nna ya bụ Maazị Udenze lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ nke aha ha bụ Ezinne na Ọbịageri. Mgbe Ọkwadike chọrọ ịlụ nwaanyị, ọ lụrụ Egodị. Egodị bụ nwa agbọgho mara mma e ji eje mba ma gụkwaa maka ịbụ onye ọgbakọ ego na mahadum. Ezema nwa nwunye dị nne ya malitere inwe anya ụfụ n'ebe Ọkwadike nọ. Iwe ya bụ na ọ gaghị adị ndụ hụ ebe Ọkwadike lụrụ nwaanyị ka nke ya mma. Ọ gara na nke dibịa gwọọ ọgwụ ka Egodị ghara ịmụta nwa. Mgbe otu afọ gachara, o nweghị ihe a hụrụ. Ọkwadike na nwunye ya bụ Egodị gara ụlọogwụ elu na ala ma o nwekwaghị ihe a hụrụ. Egodị bidoro bewere chi ya akwa ma werekwa ekpere mere nri. Ka ọ na-eme ọnwa iri na otu, ahụ Egodị bidoro igbanwe, ya na dị ya gara ụlọogwụ, o wee bụrụ na ọ dị ime ọnwa atọ. Ọ mechara mụọ ụmụ ejima. Añụrị juputara ya na dị ya obi n'ihi na chi ha kwesịrị ntụkwasị obi. Mgbe oge ruru ha iga ụka nwa, ha siri nri dị iche iche ma kpọọ ndị mmadụ. Ezema siri ka ọ gaa mara ma ọ bụ eziokwu, sịkwa na ọ gaghị adị ndụ o mee. Ka o ruru, ọ hụrụ ụmụaka abụọ ahụ. Ọ daa n'ala ma bido sawa asịsa si na ọ bụ ya mere na Egodị amụtaghị nwa ka mgbe. Ndị obodo bidoro buwa ya asọ, ụfọdụ malite iti ya ihe nke na Igwe ha bụ Obieziokwu zigara ndị odibo ya ka ha gaa chụpụ ya n'obodo n'ihi arụ o mere. Aha nwunye Ọkwadike bụ

  • A. Egodị.Correct
  • B. Ezema.
  • C. Ezinne.
  • D. Nnedị.

Explanation

Ọkwadike chọrọ ịlụ nwaanyị, ọ lụrụ Egodị: his wife is Egodị.

Igbo Language 2025 Objective — Question 2

Ụmụ Egodị mụrụ dị

  • A. abụọ.Correct
  • B. anọ.
  • C. atọ.
  • D. ise.

Explanation

'Ọ mechara mụọ ụmụ ejima' and 'ụmụaka abụọ ahụ': she had twins, so two.

Igbo Language 2025 Objective — Question 3

Mgbe Ezema hụrụ ụmụaka ọhụrụ ahụ, gịnị ka o mere? Ọ/Ọ

  • A. bidoro bewa akwa.
  • B. dara n'ala, bido sawa asịsa.Correct
  • C. gworo ọgwụ.
  • D. nọduru ala bido riwe nri.

Explanation

Passage: 'Ọ daa n'ala ma bido sawa asịsa'.

Igbo Language 2025 Objective — Question 4

Olee ihe Egodị mere mgbe ya na dị ya gachara ụlọogwụ elu na ala ma ọ mụghị nwa? Ọ/Ọ

  • A. gụba egwu.
  • B. gbaba egwu.
  • C. webe iwe.
  • D. were akwụkwọ mere nri.

Explanation

'Egodị bidoro bewere chi ya akwa ma werekwa ekpere mere nri'.

Igbo Language 2025 Objective — Question 5

Kedu ndị Igwe Obieziokwu gwara ka ha chụpụ Ezema n'obodo? Ndị

  • A. amị
  • B. nche obodo
  • C. odibo yaCorrect
  • D. ọkọrọbịa

Explanation

'Igwe ha bụ Obieziokwu zigara ndị odibo ya ka ha gaa chụpụ ya n'obodo'.

Igbo Language 2025 Objective — Question 6

EDEREEDE NKE ABỤỌ Udemma bụ nwaanyị nke atọ na ndị nwunye Maazị Nkume. Maazị Nkume bụ ọgaranya a maara nke ọma n'obodo Uguọbasa. Ọ lụrụ ụmụ nwaanyị anọ ndị mụtaara ya ụmụ iri atọ na isii mana o nweghị nke ọ zuru n'akwụkwọ n'ihi na o kwenyere na ịzụ mmadụ n'akwụkwọ bụ ịtụnye ego n'ọhịa. Udemma bụ nwaanyị nne na nna ya zuru nke ọma ma bụrụkwa onye maara uru ịgụ akwụkwọ bara. Ọ mụtaara dị ya ụmụ ise, nwoke atọ na nwaanyị abụọ. Ọ ñụrụ iyi na ụmụ ya niile ga-agacha mahadum. Ọ gara nara dị ya puku naịra iri asatọ were bido isi nri n'ahịa Eke obodo ha. Ụmụ ya niile sooro ya na-esi nri ahụ. Ụfọdụ na-asụ akpụ, ụfọdụ na-esi ofe na nri ndị ọzọ. Ha sichaa nri ahụ n'ụtụtụ, ha agawa akwụkwọ. Nne ha ji ego ọ na-azụta akwụrụ ha ugwọ akwụkwọ ma na-enyekwa ha nri. Mgbe ha gụchara mahadum. Obiọzọ, ọkpara ya bụ njinịa nwetara ọrụ n'ebe a na-emepụta mmanụ ugbọala. E bunyere ya ụgbọala ma mekwaa ya onyeisi. Ego bịara bụrụ atụrụ tawa. Ọ zigara nwanne ya nwoke bụ Obichukwu obodo oyibo, mepeere nwanne ya nwaanyị ahịa ire ọgwụ. Bịa kpọrọ nne ya Iaa Enugu, zụnye ya ụgbọala jiipu, ruọ ụlọ ọma be nna ya ma rukwaa n'Enugu. Nke a gosiri na onye ruọ n'anwụ o rie na ndo. Maazị Nkume mụrụ ụmụ iri atọ na

  • A. abụọ.
  • B. anọ.
  • C. atọ.
  • D. ise.

Explanation

'ụmụ iri atọ na isii': thirty-six children.

Igbo Language 2025 Objective — Question 8

Ahịrị nke zipụtara ajụjụ nzaraonwe ebe a bụ

  • A. afọ tara ya mmiri.
  • B. akwa ọkụkọ ọ na-eti akụ?
  • C. ị bụ onye ebee?Correct
  • D. nwanne gị dịka nne gị.

Explanation

'Ị bụ onye ebee?' is the question sentence (ajụjụ).

Igbo Language 2025 Objective — Question 9

Họpụta nke esoghị n'egwuregwu ndị Igbo ebe a.

  • A. Egwu ọnwa
  • B. Igụ akwụkwọCorrect
  • C. Igba kpakpankoro
  • D. Igba mgba

Explanation

Reading (igụ akwụkwọ) is not a traditional Igbo game.

Igbo Language 2025 Objective — Question 10

Otu na ndị a abụghị ilu Igbo

  • A. Agbịsị gbaa otule ọ mụrụ akọ.
  • B. Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ.
  • C. Awọ anaghị agba ọsọ ehihie n'efu.
  • D. Bianụ ka m kuziere unu ihe.Correct

Explanation

'Bianụ ka m kuziere unu ihe' is an ordinary sentence, not a proverb.

Igbo Language 2025 Objective — Question 13

Ọnwụ, ebee ka ị nọ? Ajụjụ a bụ ọmụmaatụ

  • A. egbeokwu.
  • B. mbụrụ.
  • C. mmemmadụ.Correct
  • D. nhagideokwu.

Explanation

Death is addressed as a person: personification (mmemmadụ).

Igbo Language 2025 Objective — Question 14

Adaeze bụ okoso. Nke a pụtara na Adaeze na-

  • A. agụ oke akwụkwọ.Correct
  • B. agba oke egwu.
  • C. arụ oke ọrụ.
  • D. egwu oke egwu.

Explanation

Okoso means a diligent reader/studious person.

Igbo Language 2025 Objective — Question 19

Olee nke zipụtara okwuntụhị na ndị a?

  • A. Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ
  • B. Gwa m gwa m gwa m otu ibe ji zuru uwa ọnụ
  • C. Ikuku na-ama n'ọnya.
  • D. Papa Pịta patara popo panye papa Pọlụ.Correct

Explanation

A tongue twister (okwuntụhị) repeats similar sounds: 'Papa Pịta patara popo...'.

Igbo Language 2025 Objective — Question 21

Ndị a niile bụcha akpaalaokwu ma e wepụ

  • A. afọ ịta ya mmiri.
  • B. iji eze ekpe ekwere.
  • C. ime aka abụọ.
  • D. ime ka nne ya.Correct

Explanation

The other four are idioms; 'ime ka nne ya' is not.

Igbo Language 2025 Objective — Question 22

Kedu ahịrị nke zipụtara myiri ebe a?

  • A. Adaku dịka nwanne ya.Correct
  • B. Agwọ tagburu ndị mmadụ taa.
  • C. Nkechi bụ ekwensu.
  • D. Nneka tara isi mbe.

Explanation

A simile uses 'dịka' (like): 'Adaku dịka nwanne ya'.

Igbo Language 2025 Objective — Question 24

Ọnwa ole ka Ndụbuakụ nọ tutu ọ tụrụ ime mgbe a lụtara Unenka?

  • A. Otu ọnwa
  • B. Ọnwa abụọ
  • C. Ọnwa anọ
  • D. Ọnwa atọCorrect

Explanation

Answer based on the set text.

Igbo Language 2025 Objective — Question 25

Mgbe onye dibịa Bekee lere Ndụbuakụ anya nke ọma, ọ chọpụtara na ọ dị ime ọnwa

  • A. anọ.
  • B. asaa.
  • C. asatọ.Correct
  • D. atọ.

Explanation

Answer based on the set text.

Igbo Language 2025 Objective — Question 36

"Gbanyere m okuku asatọ maka na emere m ehi asatọ." Onye kwuru okwu a bụ

  • A. Maazị Gbazuoagụ.
  • B. Maazị Ibekwe.
  • C. Maazị Nwanganga.Correct
  • D. Nze Nwaọkọnkwọ.

Explanation

Answer based on the set text.

Igbo Language 2025 Objective — Question 37

Onye aha mmirichukwu ya bụ "Ojiọnụeme" n'ejije a bụ

  • A. Maazị Azụanụụka.
  • B. Maazị Ibekwe.
  • C. Maazị Ọnyịrịụka.
  • D. Nze Nwaọkọnkwọ.

Explanation

Answer based on the set text.

Igbo Language 2025 Objective — Question 38

N'akwụkwọ ejije a, Nwakaego na Obi bụ nne na nna (Nwaanyị Bụ Ihe)

  • A. Chinaagọrọm.
  • B. Didịụkọ.
  • C. Ekweekwe.
  • D. Nwadịụtọ.

Explanation

Answer based on the set text.

Igbo Language 2025 Objective — Question 40

Nne bịkọ ewela iwe Ama m na onye ara a Agaghị anwa anwa metụ gị aka ọzọ Ọ kachikwaanụ nti M gwa ya ihe e ji isi oke eme Onye kwuru okwu ndị a?

  • A. EkweekweCorrect
  • B. Maazị Akọbụche
  • C. Maazị Obi
  • D. Obinwanne

Explanation

Answer based on the set text.

Igbo Language 2025 Objective — Question 46

"Ebe a kụrụ kpom Ọ gbara gawa O nweghị akaọrụ ọbụla Chetakwa Nkụ onye kpara n'okochi Ka ọ na-anya n'udummiri." N'abụ Onye Umengwụ, ahịrị ndị a kara ihe n'okpuru bụ

  • A. akpaalaokwu
  • B. egbeokwu
  • C. iluCorrect
  • D. mbụrụ

Explanation

'Nkụ onye kpara n'okochi ka ọ na-anya n'udummiri' is a proverb (ilu).

Igbo Language 2025 Objective — Question 53

Ọrụ dịịrị ụmụaka n'ezinaụlọ bụ ndị a ma e wepụ

  • A. isi nri.Correct
  • B. ịkpata nkụ.
  • C. ịkpata nri ewu na aturu.
  • D. ịsa efere.

Explanation

Cooking is not a child's duty.

Igbo Language 2025 Objective — Question 59

Omenaala a na-emere nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ n'ala Igbo bụ

  • A. ile ọbịa.
  • B. ile ọmụgwọ.Correct
  • C. iru mgbede.
  • D. ịlụ nwaanyị.

Explanation

'Ọmụgwọ' is the postnatal custom.

Advertisement

Sign up free to unlock

  • Score tracking
  • Practice history
  • Saved questions
  • Progress dashboard
  • Personalized sessions
  • Weak-topic breakdown

…and/or go further with premium services and No Ads.