Free account: track your progress — Sign up free

BECE Igbo Language 2025 Objective — Question 6

Question 6 of 67 from the Basic Education Certificate Examination (Junior WAEC) (BECE) Igbo Language 2025 Objective paper, with the correct answer and a full explanation.

Advertisement

EDEREEDE NKE ABỤỌ Udemma bụ nwaanyị nke atọ na ndị nwunye Maazị Nkume. Maazị Nkume bụ ọgaranya a maara nke ọma n'obodo Uguọbasa. Ọ lụrụ ụmụ nwaanyị anọ ndị mụtaara ya ụmụ iri atọ na isii mana o nweghị nke ọ zuru n'akwụkwọ n'ihi na o kwenyere na ịzụ mmadụ n'akwụkwọ bụ ịtụnye ego n'ọhịa. Udemma bụ nwaanyị nne na nna ya zuru nke ọma ma bụrụkwa onye maara uru ịgụ akwụkwọ bara. Ọ mụtaara dị ya ụmụ ise, nwoke atọ na nwaanyị abụọ. Ọ ñụrụ iyi na ụmụ ya niile ga-agacha mahadum. Ọ gara nara dị ya puku naịra iri asatọ were bido isi nri n'ahịa Eke obodo ha. Ụmụ ya niile sooro ya na-esi nri ahụ. Ụfọdụ na-asụ akpụ, ụfọdụ na-esi ofe na nri ndị ọzọ. Ha sichaa nri ahụ n'ụtụtụ, ha agawa akwụkwọ. Nne ha ji ego ọ na-azụta akwụrụ ha ugwọ akwụkwọ ma na-enyekwa ha nri. Mgbe ha gụchara mahadum. Obiọzọ, ọkpara ya bụ njinịa nwetara ọrụ n'ebe a na-emepụta mmanụ ugbọala. E bunyere ya ụgbọala ma mekwaa ya onyeisi. Ego bịara bụrụ atụrụ tawa. Ọ zigara nwanne ya nwoke bụ Obichukwu obodo oyibo, mepeere nwanne ya nwaanyị ahịa ire ọgwụ. Bịa kpọrọ nne ya Iaa Enugu, zụnye ya ụgbọala jiipu, ruọ ụlọ ọma be nna ya ma rukwaa n'Enugu. Nke a gosiri na onye ruọ n'anwụ o rie na ndo. Maazị Nkume mụrụ ụmụ iri atọ na

  • A. abụọ.
  • B. anọ.
  • C. atọ.
  • D. ise.

Explanation

'ụmụ iri atọ na isii': thirty-six children.

Advertisement

Sign up free to unlock

  • Score tracking
  • Practice history
  • Saved questions
  • Progress dashboard
  • Personalized sessions
  • Weak-topic breakdown

…and/or go further with premium services and No Ads.